1 of 2Classic · 2 chapters

This film is a perfect introduction to Jesus through the Gospel of Luke. Jesus constantly surprises and confounds people, from His miraculous birth to His rise from the grave. Follow His life through excerpts from the Book of Luke, all the miracles, the teachings, and the passion. God creates everything and loves mankind. But mankind disobeys God. God and mankind are separated, but God loves mankind so much, He arranges redemption for mankind. He sends his Son Jesus to be a perfect sacrifice to make amends for us. Before Jesus arrives, God prepares mankind. Prophets speak of the birth, the life, and the death of Jesus. Jesus attracts attention. He teaches in parables no one really understands, gives sight to the blind, and helps those who no one sees as worth helping. He scares the Jewish leaders, they see him as a threat. So they arrange, through Judas the traitor and their Roman oppressors, for the crucifixion of Jesus. They think the matter is settled. But the women who serve Jesus discover an empty tomb. The disciples panic. When Jesus appears, they doubt He's real. But it's what He proclaimed all along: He is their perfect sacrifice, their Savior, victor over death. He ascends to heaven, telling His followers to tell others about Him and His teachings.

Ask yours

Bible Quotes

Share
Free Resources

Want to understand the Bible more deeply?

Join our Bible study

Transcript

Igbo (Asụsụ Igbo)
Lee ka Chineke siri dị ukwu, ebuliwo Gị elu n'ike, ị dị ukwu karịa ihe niile. Ọ kere ihe niile site n'okwu Ya. Eluigwe na-akọ ịdị ukwu Ya, mbara igwe na-egosi ọrụaka Ya dị ebube. Ihe niile Chineke kere dị mma. Ihe niile kpughere ịdị ukwu Ya na ịdị mma Ya na ike Ya. Chineke kere osisi niile dị iche iche, na anụmanụ niile dị iche iche. Mgbe ahụ ọ kpuru nwoke mbụ site n'aja nke ala, O kunyere ume n'ime ya ma nyekwa ya ndụ. Nwoke mbụ ahụ ka-akpọrọ Adam. Chineke wee were otu ọkpụkpụ akụkụ ahụ nke Adam, site na ya ka-ositere wee kepụta nwanyị. Ka ọ bụrụ nwunye Adam na onye inyeaka ya. Nke ahụ bụ nwanyị mbụ, a kpọrọ ya Ivu. Chineke ji ụfodu ihe e jiri mara Ya ke nwoke ahụ na nwanyị ahụ, ka Ya na ha wee nwee ike ịdị na-emekọrịta. Ha biri n'ọn̄ụ n'ihu Ya n'ubi agbara ogige, edoziri nke ọma nye ha a kpọrọ Iden. Ahụhụ na ọnwụ adịghị na ya. Chineke sịrị Adam "Ị nwere ike iri mkpụrụ niile si n'ubi a ma e wepụkwa otu. Ọ bụrụ na gị erie mkpụrụ sitere n'osisi a, ị ga-anwụ". Ma otu ụbọchị, Ekwensu nwara Ivu ka o rie mkpụrụ ahụ. O were mkpụrụ ahụ rie ụfọdụ ya, di ya rikwara. Ha mere nke a n'ihi na ha kwenyere Ekwensu kama ikwenyere Chineke. N'ihi omume ihere a, mmekọrịta ha na Chineke mebiri, n'ihi na Chineke dị nsọ, ndị mmehie adịghị ebi n'ebe Ọ nọ. N'ihi nke a, Chineke chụpuru Adam na Ivu n'ogige Iden, Nupụ isi ha nye Chineke Nna, wetere ha ihe ihere. N'ihi nke a, Adam na Ivu na ụmụ ha nọzi n'ahụhụ nke ihe mgbu na ọnwụ. Ma Chineke onye omiko nwere atụmatụ ịdụbata ụmụ Adam ka Ya na ha na-enwe mmekọrịta ọzọ. Ma binyekwara Ya ruo mgbe ebighị ebi n'alaeze Ya. N'ime Akwụkwọ Nsọ, Chineke kpughere atụmatụ Ya maka ịzọpụta mmadụ pụọ n'ahụhụ nke kwesịrị ya, Wepụ mmehie na ihere ha na ịkpọghachi ha azụ n'ime nkwekọrịta nke Ya na ha. Chineke gosiri Abraham ụfọdụ atụmatụ ndị a. Abraham kwenyere Chineke ma bulie Ya elu. Chineke kwere ya nkwa ịgọzi ya na ịgọzi ndị niile bi n'ụwa niile site na ya. O kwere ya nkwa inye ya ọtụtụ ụmụ dịka aja dị n'ala n'akụkụ osimiri... na kpakpando dị n'eluigwe. Abraham kwenyere Chineke. Chineke gụnyere Abraham dịka otu n'ime ndị ọrụ Ya bụ onye ezi omume wee kpọọ ya enyi Chineke. Otu ụbọchị, Chineke nwalere Abraham ịmata ma ọ ga-atụkwasị Ya obi ma debe iwu Ya. Ọ sịrị Abraham jiri nwa ya chụọrọ Ya aja. Abraham matara na ọ bụ site n'otu nwa ya a ka Chineke kwere nkwa inye ya ọtụtụ ụmụ, ma ọ tụkwasịrị Chineke obi, wee rube isi. N'ihi nke a, ọ jikere igbu nwa ya, iji chụọ aja nye Chineke. Abraham weliri mma ya elu. Ma Chineke sịrị ya, Abraham! Emerụla nwata ahụ ahụ. Ama m na ị na-atụ egwu M ma dịrị njikere ịrubere M isi. Mgbe ahụ Abraham wee hụ ebule nọ ya nso mpi ya konyere n'ọhịa. Abraham wee were ebule ahụ Chineke wetara jiri ya chụọrọ Chineke aja n'ọnọdụ nwa ya. Oge Chineke onye omiko na onye ebere wetara ebule e jiri chụọ aja, n'ọnọdụ nwa Abraham, O gosiri Abraham ịhụnanya Ya dị ukwu nye ụmụ mmadụ, ịhụnanya a dịka ịhụnanya ezigbo nna na-enwe nye nwa ya. Site na-ịme ihe a, Chineke gosiri na Ya họpụtara aja a ga-achụ n'ọnọdụ ụmụ mmadụ. Chineke onye obi ebere gbara ama n'Akwụkwọ Nsọ, na Ọ ga-ezite onye na-enweghị mmehie ka ọ nwụọ n'ọnọdụ ụmụ Adam wee wepụ mmehie na ihere ha. Site n'aja a dị ukwu, Ọ ga-emeghe ụzọ nye ndị kwere na Ya, ibi na nkwekọrịta ha na Chineke ruo ebighị ebi n'alaeze Chineke. Ndị amụma kpọrọ onye a "Onye Nzọpụta," ha sịrị na Chineke ga-ezite Onye Nzọpụta ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ, ka ọ bụrụkwa eze ha, na-achịkwa ha ruo mgbe ebighị ebi n'aha Chineke. Ọtụtụ narị afọ gara aga tupu Ọ bịa, ndị amụma kwuru okwu banyere ihe ndị ahụ Mesaịa ga-eme, na-kwa ihe ndị ahụ gaje ime ya Ndị amụma kọwara ya dịka Ọkpara Chineke, ma kwekwa na ọmụmụ ya ga-abụkwa ihe ịrịba ama. Onye amụma Aịsaịa siri: "Otu nwagbogho namaghi nwoke gaturu ime ma muo kwa nwa nwoke." Ndị amụma dekwara sị na a ga-amụ Mesaịa na Betlehem. Ha kwukwara na ọ ga-abatakwa Jerusalem dịka eze n'elu ịnyịnya. Ha dekwara sị na ezigbo enyi ya ga-arara Ya nye n'ihi mkpụrụ ọlaọcha iri atọ. Ndị amụma kwuru sị na Onye Nzọpụta anyị ga-eji ndụ ya chụọ aja, mana Chineke ga-akpọlite ya n'ọnwụ n'ụbọchị nke atọ. Ndị amụma kpọrọ Onye Nzọpụta ahụ Nwa nke Mmadụ, ma sị na ọ ga-arịgoro n'eluigwe. Chineke ga-enye ya ikike n'ebe mba niile nke ụwa nọ ruo mgbe ebighị ebi. Puku afọ abụọ gara aga otu onye biri n'ụwa nke a; aha ya bụ Jisọs. Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe ndị o mere, ha jụrịtara onwe ha. Ọ bụ Ya bụ Mesaịa ahụ; ndụ Jisọs mezuru ihe ndị amụma kwuru banyere Onye Nzọpụta ahụ. Onyonyo a na-egosi onye Jisọs bụ. Na ihe ụfọdụ ndị o kwuru ma mee dịka edere ya n'Akwụkwọ Nsọ. N'ime onyonyo a, otu nwoke nọchitere anya Jisọs. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ime nke a, kama e mere onyonyo a ka ndị mmadụ nwee ike ịmata na ịmụtakwa ihe banyere obibi ndụ Jisọs, nakwa inwe ike ịnata ngọzi niile Chineke kwere na nkwa. A na m edegara gị akwụkwọ Tiọfilọs, banyere ihe ndị ahụ meworo n'etiti anyị, ị wee ghọta ihe bụ eziokwu banyere ihe niile Mgbe Siza Ogostos na-achi ndi Rom, na mgbe Herod bukwa Eze ndi Judia, Chineke zigaara Mmuo ozi Gebrel izi otu nwa-agbọghọna-amaghi-nwoke ozi, na Nazaret Aha nwa-agbọghọ ahụ bụ Meri. Atụla egwu, Meri... ...n'ihi na i natawo amara n'iru Chineke. I ga-atụrụ ime, I ga-amụkwa-nwa-nwoke, I ga-akpọkwa aha ya...Jisọs! Nke a ga-esi aghaa mee? Abụ m onye na-amaghi nwoke. Mụọ nsọ ga-abịakwa sị gị. Nihi nkea agakwa-akpọ ya, okpara nke Chineke di elu. Ala-eze-ya agaghi ebi ebi. Meri biliiri jee Judia, n'ụlọ Elizabet nwanne ya, nke dikwa ime site n'olu ebube nke Chineke. Elizabet! Meri! Nwanne M Meri! I bu onye agọziri n' etiti Umu nwanyi nile. Ọ bụkwa onye agọziri agọzi ka nwa gi ga-abu. N'ihi na ngwa ngwa m nụrụ olu gi, nwata nọ m n'afọ wụliiri elu n'onu. Mkpuru obi m na-eme ka onye-nwe-anyi di ukuu. Mmụo m na-nurikwa n'ime Chineke, onye nwe m. Site taa, ogbo nile ga-akpọ m "onye agọziri agọzi." Ka ndị Nazaret ghọta nke a, site n'iwu Siza Ogọstọs, aga-agụkọ mmadụ nile ọnụ... ...ndị o na-achị n'ime Galili na Judia. A ga-edebanyerịrị aha mmadụ niile n'akwụkwọ... ...n'obodo nke aka ha, nke bụ n'obodo nna ha. Meri wee jee Betlehem ka ewee deba aha ya na Josef, bụ onye na-achọ ilụ ya, n'akwụkwọ. Mana ha enwetaghi ọnọdụ n'ụlọ ndị-ije na Betlehem. O bụ nanị n'ụlọ anumanụ ka ha nwetaara ọnọdụ. Ndị ọzụzụ atụrụ nọkwa n'obodo ahu, na-echekwa aturu ha n'abali. Mgbe mmụọ-ozi Chineke biaruru ha nso, ebube mee onye-nwe-anyi mụbakwara ha gburugburu. Taa, n'obodo nke David ka amụrụ, nye unu, Kraist, bụ onye nzọpụta. Ndị ọzụzụ atụrụ ahu wee mee ngwa ngwa, jee hụ nwata ahụ ebe atọgbọrọ ya n'ụlọ anụ. Ha onwe ha bụkwa ndị mbụ Kwusaara ozi ọma nke omụmụ onye nzọpụta ahu. Mgbe otu izu ụka gasiri, n'ubochi obibi ugwu ya, agụrụ ya Jisọs. Josef na Meri wee kpọrọ ya jee Jerusalem ịche ya n'ihu Chineke. Otu nwoke dị nke bụ onye ezi omume, nke na-atụkwa egwu Chineke, n'ụlọ ukwu Chineke, onye nke Mmụọ Nsọ kweere nkwa na ọ gaghị ahụ ọnwụ, ma ọ bụrụ na ọ hụghị Kraịst. Aha ya bụ Simiọn. Ugbu a onye-nwe-anyị, ka ọrụ Gị laa n'udo dịka okwu ọnụ Gị siri dị. N'ihi na. Anya m ahụwo nzọpụta Gị. Nwata a bụ onye Chineke họpụtaara. Ka unu bụrụ ndị a gọziri agọzi. Mgbe ha mesịrị ihe niile dịka iwu Mosis siri dị, ha hapụrụ Jerusalem laghachi Nazaret. Mgbe Jisọs gbara afọ iri na abụọ, Josef na Meri kpọọrọ ya jee Jerusalem maka ememe Ngabiga. Mana, mgbe ha malitere ịlaghachi, ha chere na Jisọs soro ha, ma o soghị ha. Ha wee laghachi na Jerusalem ịchọ ya. N'ụbọchị nke atọ, ha chọtara ya n'ụlọ ukwu Chineke ebe ọ nọdụrụ ala n'ihu ndị ozizi. Nwa onye ka nwa a bụ nke na-ajụ ajụjụ ndị a? Ọ si Nazaret. Anyị chere na o soro anyị laa. Biko, gbagharanụ ịnụ ọkụ n'obi ya. Ọ tụrụ ndị nụrụ ozizi ya n'anya. Nwa m! Gịnị mere i jiri mee anyị otu a? Ọ nyere mụ na nna gị nsogbu nke ukwu ịchọta gị. Gịnị mere unu ji achọ m? Ọ bụ na unu amaghị na m ga-arụ ọrụ nke Nna m? O wee soro ha laghachi Nazaret, na-etokwa n'amamihe na amara, n'ihu Chineke na mmadụ. N'afọ nke iri na ise mgbe Taịberiọs malitere ịchị ndị Rom... ...mgbe Pọntiọs Paịlet na-achịkwa Judia... ...na mgbe Herọd na-achị Galili... ...mgbe Annas na Kaịafas, bụ ndị isi nchụaja... ...Okwu nke Chineke bịakwuteere Jọn n'ọzara. O wee jee obodo niile dị Jọdan nso ikwu okwu Chineke, ịkwusa baptism nke nchegharị, na mgbaghara mmehie. Chegharịanụ chigharịkwanụ, Ka e meekwa unu baptism! Chineke ga-agbaghara unu! Dịka edere ya n'akwụkwọ onye amụma Aịsaịa: "Olu otu onye na-eti mkpu n'ọhịa sị: dozienụ okporo ụzọ onye-nwe-anyị!" Meenụ okporo ụzọ onye-nwe-anyị ka o guzozie. A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, a ga-emekwa ka ugwu ọbụla dị ala. Ebe gbagọọrọ agbagọ ga-eguzozi. Ụzọ mkpọtụkpọ niile ga-adịkwa larịị. ...Mmadụ niile ga-ahụkwa Nzọpụta nke Chineke. Gịnị ka anyị ga-eme? E, gwa anyị ihe anyị ga-eme? Unu ọgbọ nke ajụala! Gịnị ka ịchọrọ ka anyị mee? Gwa anyị... gwa anyị ụzọ anyị ga-eso. Onye nwere uwe abụọ ya nye onye na-enweghị ma otu. Onye nwekwara ihe oriri, meekwaa otu a. Onye ozizi... anyị bụ ndị ọna-ụtụ. Gịnị ka anyị ga-eme? Ụnụ agaghị anara ụtụ, karịa ka e kwuru. Kedụ maka anyị? Gịnị ka anyị ga-eme? Unu apụnarịla mmadụ ego ha n'ike. Unu ebola onye ọbụla ebubo ụgha. Ka afọ ju unu n'ụgwọ ọnwa unu. Gwa anyị... ...Ị bụ Kraịst? Eji m mmiri na-eme unu baptism, mana otu onye na-abịa nke karịrị mụ onwe m ukwu. Erughị m eru ikepu eriri akpụkpọ-ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptism. O jikwa ihe nfụcha ọka n'aka ya, ifụcha igbugbo ọka site n'ọka. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka niile tinye ha n'ọba ya. Mmụọ Nsọ dịka ndụrụ wee bekwasị Jisọs n'arụ. Otu olu wee si n'elu-igwe sị: Ị bụ ọkpara M hụrụ n'anya, ihe gị dị m ezi mma. Mgbe Jisọs maliteere ọlụ ya, ọ gbaara iri afọ atọ. O juputere na Mmụọ Nsọ mgbe ọ rigopụtaara site na Jọdan. Mmụọ Nsọ wee duru ya jee n'ọhịa, ebe ekwensu nwaara ya iri ụbọchị anọ. O buuru ọnụ n'ụbọchị ndị a. Ekwensu wee sị ya: Ọ bụrụ na Ị bụ ọkpara Chineke, mee ka nkume a ghọọ achịcha. Edewo ya: Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ kama site n'okwu Chineke. Ekwensu wee duru ya gosi ya ala-eze niile nke ụwa na nwa mgbe nta. M ga-enye gị ike a niile, na ebube ha, n'ihi na ọ bụ mụ ka e nyefere ha n'aka; enwekwara m ike inye ha onye ọ bụla nke masịrị m. Ha niile ga-abụ nke gị, ma ọ bụrụ na Ị fee m ofufe. Edewo ya, "Nanị onye-nwe-gị ka Ị ga-efe, nanị ya ka Ị ga-ekpekwara." Ekwensu wee duru ya jee n'elu ụlọ-ukwu Chineke na Jerusalem. Ọ bụrụ na Ị bụ ọkpara Chineke, tụdata onwe gị site n'ebe a, n'ihi na edewo ya sị: "Ndị mmụọ ozi ya ka Ọ ga-enye iwu ichebe gị." Ọzọ ọ bụkwa n'elu aka ha ga-eburu gị ka ị ghara ịkpo ụkwụ gị na nkume. Akwụkwọ Nsọ sịrị: "Anwakwala onye-nwe gị ọnwụnwa." O wee bịa Nazaret ebe a zụliteere ya. Kedụ! Ọ dị mma! N'ụbọchị izu-ike, ọ gaara n'ụlọ ukwu Chineke, dịka o na-eme. Ha wee kpọọ ya ka ọ gụpụta site n'akwụkwọ Aịsaịa. Mmụọ Nsọ Chineke nọnyeere m. N'ihi na Ọ họpụtaara m izisara ndị ogbenye ozi ọma. O ziteere m ime ka ndị e kere agbụ nwere onwe ha, ka ndị kpuru ìsì wee hụ ụzọ. Ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha; na ịgwa unu na oge abịawo mgbe onye-nwe-anyị ga-azọpụta ndị ya. Ọ na-ekwu nke ọma... Taa ka emezuworo ihe edere n'Akwụkwọ Nsọ, dịka a gụrụ ya na ntị unu. Na Akwụkwọ Nsọ emezuwo?! Mana, ọ bụ nanị Mesaịa pụrụ imezu nkwa a! Kedụ otu anyị ga-eji mara? Ọ tụghị m n'anya na unu ga-atụrụ m ilu a sịrị: "Ọgwọ ọrịa, gwọọ nụ onwe gị." Unu ga-asịkwa m, "Mee n'obodo nke aka gị ihe ndị ahụ anyị nụrụ Ị mere na Kapanịom." Ka m gwa unu nke a! Onye amụma enweghị ugwu n'obodo nke aka ya. Site n'okwu a, Jisọs kọwaara onwe ya dịka Mesaịa, onye Chineke teere mmanụ, nke o ziteere ịzọpụta ndị ya. Mana ndị Juu anabataghị ya dịka Mesaịa... Nzube ha bụ ikwada ya site n'elu ugwu. Mana, o sitere n'etiti igwe mmadụ ahụ pụọ... ....wee wezụga onwe ya... ...bịaruo Kapanịom, obodo nta nke Galili. Ọchịchị ndị Rom dị n'ebe niile n'oge ahụ. Ndị Juu na-achọkwa Mesaịa nke ga-anapụta ha n'ọchịchị aka ike dị otu a. Udo dịrị gị. Ya dịkwara gị. Ụgbọ gị, ọ ga-aba m, Saimọn? E nụ. Ọ naghị apụ apụ, ọ kwa ya? Gwa anyị okwu! Gwa anyị okwu! Gwa anyị okwu! Jisọs, gwa anyị okwu! O nwere otu mgbe mmadụ abụọ jeere ikpe ekpere. Otu bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ. Onye Farisii ahụ wee guzoro onwe ya kpee sị: "Ekele m Gị Chineke n'ihi na a bụghị m onye anya-ukwu na anaghị m akwa iko dịka ndị ọzọ. Ekele dịrị Gị n'ihi na adịghị m dịka onye ọna-ụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n'otu izu ụka, ana m enye otu-ụzọ-n'ụzọ-iri m." Mana onye ọna-ụtụ ahụ guzooro n'ebe dị anya, ọ nweghịkwa ike iwelite anya ya elu. Mana o tiiri aka n'obi ya sị, "Chineke meere m ebere, onye mmehie." Asị m unu, onye ọna-ụtụ ahụ, ọ bụghị onye Farisii ahụ, nataara ihu ọma n'ebe Chineke nọ. N'ihi na onye na-ebuli onwe ya elu a ga-eweda ya, onye na-eweda onwe ya, a ga-eweli ya. Kwapụ nụ ụgbọ unu n'ebe miri emi. Chibakwanụ ụgbụ unu n'ime mmiri maka igbu azụ. Onye-ozizi, anyị lụrụ ọrụ anyasị niile, ọ dịghị azụ anyị jideere. Mana, ọ bụrụ na Ị kwuuru otu a, m ga-eme dịka ị kwuru. James! Jọn! James! Jọn! Buru nụ ụgbọ unu bịa ebe a, mee nụ ngwa! Nyere anyị aka! Aka anyị juru eju! O zuola, O zuola. Si n'ebe m nọ pụọ, onye-nwe-anyị, onye mmehie ka m bụ. Atụla egwu! Site taa Ị ga-na-akụta ndị mmadụ. Bịa, nụrụ okwu m; Ị ga-enwe ndụ... Chọọ Chineke mgbe ịga-achọta ya; kpọ ya mgbe ọ nọ nso. Ka onye ajọ-omume hapụ ụzọ ya niile; hapụkwa echiche ya niile, ka ọ loghachikwute Chineke, o ga-emekwara ya ebere... Ọ ga-agbaghara ya n'izu oke. O ga-eji ọṅụ laa; ọ bụkwa udo ga-na-edu ya. O na-abịa. O nọ n'ebe a, lee ya! Jisọs! Biko, bịa zọpụta nanị otu nwa nwanyị m nwere! Biko, mee ebere. Ọ gbaara afọ iri-na-abụọ. Ọ na-anwụ! Biko, biko, soro m bịa! Jairọs, ọ bụ ihe nwute... Jisọs! ...Nwa gị anwụọla. Esogbula ya, Ọzọ. Atụla egwu. Nanị kwere ọ ga-adị mma. Erula ụjụ. Ọ nwụghi anwụ. Kama, ọ na-ehi ụra. Nwata, bilie. Nye ya nri ka o rie. Enye m unu iwu... ...Agwala onye ọ bụla ihe mere. Mgbe nke a gasịrị, ọ hụrụ otu onye ọna ụtụ, aha ya bụ Matiu Livai, na-ebe ọ na--anakọta ụtụ. Soro m. Jisọs wee rigoro n'elu ugwu ikpe ekpere. O kpere ekpere ebe ahụ anyasị niile. Mgbe chi bọọrọ, O keleere mmadụ iri-na-abụọ ahụ, ndị ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya. Saimon, nke ọ kpọọrọ Pita... na Andrụ, nwanne ya... James... na Jon... Filip... na Batlomi... Matiu... na Tọmọs... James, nwa Alfaọs... na Saimon, nke ana-akpọkwa Zelot... na Judas, nwanne James... na Judas Iskariọt, nke ga-arara ya nye. Ngozị ga-adịrị ndị ogbenye, n'ihi na ala-eze Chineke bụ nke ha. Ngọzị ga-adịrị ndị aguụ n'ihi na afọ ga-eju ha. Ngozị ga-adịrị ndị na-eri ụjụ n'ihi na ha ga-achị ochị. Ngozị ga-adịrị unu mgbe ana-akpọ unu asị, mgbe ana-ajụ unu... mgbe ana-ekwugidekwa unu n'ihi Nwa nke Mmadụ. Ṅurịa nụ mgbe nke a na-eme, ka obi dịkwa unu ụtọ... ..N'ihi na ụgwo-ọlụ unu dị ukuu n'elu igwe. N'ihi na nnanna ha kwukwara otu a nye ndị amụma. ...16, 17, 18, 19, 20 Ọbụ ihe m nwere. Kedụ ihe nke a pụtaara. O ga-esiri unu ike ndị ọgaranya, unu nweere ihe ọma unu n'ụwa a. Ọ chọghi iba ọgaranya, n'ezie isi adịghị ya mma. Ahụhụ ga-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a... ...n'ihi na unu ha ga-eri ụjụ Ahụhụ ga-adịrị unu mgbe ana-ekwu ezi ihe banyere unu, n'ihi na nnanna unu kwuru otu a nye ndi amụma ugha. Mana asị m unu ndị na-ege m ntị, hụ nụ ndị iro unu n'anya. Mee nu ihe ọma nye ndị na-akpọ unu asị. Gọzie nụ ndị na-abụ unu ọnụ. Na-ekpere nụ ndị iro unu ekpere. Onye ọ bụla nke mara gi aka-ntị, tugharịa nke ọzọ ka o mazuo ya. Onye o bụla nke chịịrị uwe gi, nyekwaa ya nke ime gi. Nye onye o bula nke na-arịọ ihe ọbula. Onye ọbụla nke weere ihe gi, hapụrụ ya ihe ahu. Meere ndị ọzọ ihe ndị ahụ Ị chọrọ ka ha meere gi. Ọ bụrụ na ọ bụ nani ndị hụrụ gi n'anya ka I hur ha n'anya, I nweghi ụgwọ ọlụ. N'ihi na ndi mmehie na-emekwa otu ahu. Ọ bụrụ na ọ bụ nani ndi na-emere gi ihe ọma ka i na-emere ihe oma... Gini mere I ji ele anya ngọzi? Ndị mmehie na-emekwa otu ahụ. Kedụ otu ọ ga-esi bitụ ya aka? Kedụ otu o ga-esi gwa ya okwu? Nsogbu! E, e hụnụ ndi iro unu n'anya, na-emere ha ihe omạ Na-ebinye ha ego, na-eleghị anya uru. Mgbe ahụ ka unu ga-enwe ụgwọ-ọlụ, 'n'ihi na unu ga-abụ ụmụ nke Chineke, N'ihi na o nwere obi ebere nye mmadụ nile. Nwee nu obi ebere, dika Nna unu, bụ Chineke. Zọputa anyi, Jisọs! Unu ekpela ikpe ka aghara ikpe unu. Akajola, ka wee aghara ikajọ unu. Gbaghara nu, aga-agbagharakwa unu. Duzie anyi, onye-nwe-anyi. Nye nụ, a ga-enyekwa unu, n'ihi na ihe unu jiri tụnyere mmadụ ka aga-eji tụnyere unu. Onyi-isi apụghi idu onye-isi ibe ya! Ọ bụrụ na o mee, ha ga-adaba n'olulu. Gini mere unu ji ahụ ahịhịa dị onye ọzọ n'anya, mana unu anaghị ahu osisi dị unu n'anya. Duzie anyi, onye-nwe anyi! Ị dị anyi mkpa ugbu a, onye-ozizi. Ngọzi na-adịrị nwanyị nke mụrụ gị, nyekwa gị ara. E,e, kama ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke na-emekwa ya. Ọ ga-amasị m ịmata nwoke a. I chere na ọ bụ, Mesaia ahụ? Onye Farisii a kpọrọ Jisọs iri nri n'ụlọ ya. Jizọs wee nọdụ ala iri nri n'ụlọ ya. Ụmụ ntakịrị, laa nụ. Unu anụla, laa nụ. Ha na-eme ihe ọjọọ nile ha nwere ike ya. Gini ka ọ na-eme ebe a? A maghị m. Gini ka ọ na-eme? Ọ bụrụ na nwoke a, bụ onye-amụma, ọ ga-amata onye nwanyị a bụ, nke na-ebitu ya aka. Ọ gaara amata ụdi ndụ ọjọọ nwanyị a, a-ebi. Ama m onye nwanyị a bụ, Saimon. Kam kọrọ gị otu ihe. Mmadụ abụọ ji otu onye ụgwọ. Otu onye jị ya nnari naịra ise, nke ọzọ ji ya iri ise. O dighi onye n'ime ha puru ikwụ ụgwoahu owee gbaghara ha. Kedụ onye ga-ahu ya n'anya karịa? Echere m na ọ ga-abụ onye nke o gbaghaara karịa. Ikwuru nke ọma. I hụla nwanyi a? Abiaara m n'ụlọ gi, I nyeghị m mmiri isa-ụkwụ, mana o jiri anya-mmiri ya na agiri isi ya saa m ụkwụ. I jighi nsutu ọnụ nabata m; Mana kamgbe m bataara ebe a ọ kwụsibeghi isutu m ọnụ n'ụkwụ. I nyeghi m mmanu olive maka isi m; Mana o jiriwo mmanu na-esi isi ụtọ tee m n'ụkwụ. N'ezie, ịhụnanya o gosiri m emewo ka a gbaghara mmehie ya niile: Mana onye a gbaghaara nke nta na-egosi ịhụnanya dị nta. A gbagharawo mmehie gị. Okwukwe gị azọpụtawo gị. Laa n'udo. Jisọs wee na-ejegharị, na-ezisakwa oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ, na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a gwọọrọ mmụọ ọjọọ na-esokwa ya ejee. Meri, nke a na-akpọ Magdalin; Juana, nke di ya bụ Chụza, onye na-ejere Herọd ozi; na Suzana. Mana Herọd, onye na-achị Galili n'okpuru ndị Rom, tinyere Jọn nke Baptism n'ụlọ mkpọrọ, n'ihi na o kweghị ka ọ lụchie nwunye nwanne ya. Ọ dịkwa mma... Mgbe anyị ruru n'ọnụ ụzọ ama Nen, anyị hụrụ ndị bu ozu. Ọ bụ ozu nwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ mụrụ nanị ya. Mgbe Jisọs hụrụ nwanyị a, obi ya juputere n'omiko. O wee metụ igbe ozu ahụ aka sị: "Nwokorobịa, asị m gị, bilie." Ozu ahụ wee bilie. Jisọs wee kpọrọ ya... ...nyeghachi nne ya... Jụọ ya sị, "Ọ bụ gị bụ onye Jọn sịrị gaje ịbịa? Ka ọ bụ anyị lewe anya onye ọzọ?" Onye ozizi! Onye nwe m! Jọn nke Baptism ziteere anyị ịjụ Ị bụ onye ahụ gaje ịbịa? Ka ọ bụ anyị lewe anya onye ọzọ? Laghachinụ, gwanụ Jọn ihe unu hụrụ, nụkwa. Ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije... Ngọzi ga-adịrị ndị na-enweghị obi abụọ banyere m. Biko, bulie m elu. N'ubu m, abụọ, ugbu a? Ị na-ahụ ya ugbu a? A na m ahụ Jisọs Ọgha mkpụrụ pụrụ ịgha mkpụrụ. Mgbe ọ na-agha, ụfọdụ daara n'akụkụ ụzọ, a zọkwara ha ụkwụ, anụ ufe nke eluigwe wee ripụ ha. Ụfọdụ dakwara na nkume, mgbe ha tolitere, ha kpọnwụrụ n'ihi na ha enweghị mmiri ọbụla. Ụfọdụ daara n'etiti ogwu. Ogwu ahụ wee soro mkpụrụ ahụ tolite, ma gbusie ha. Ụfọdụ daara n'ala dị mma, ha wee tolite, na-amị mkpụrụ na mgbe ha. na-amị mkpụrụ nnari n'otu n'otu. Onye ozizi, gịnị mere Ị na-agwa anyị okwu n'ilu... Mgbe igwe mmadụ zukọọrọ? Ihe nzuzo banyere alaeze Chineke ka ekpughere nye unu. Mana n'ebe ndị ọzọ nọ, ọ bụ site n'ilu... Ka ha ghara ịhụ mgbe ha na-ele anya... ...gharakwa ịghọta mgbe ha na-anụ. Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke. Mkpụrụ ahụ nke daara n'akụkụ ụzọ bụ ndị na-anụ okwu ahụ, Mana ajọ onye ahụ napụụrụ ha okwu ahụ site n'obi ha ka ha ghara ikwere, ma nweekwa ghọtakwa. Mkpụrụ nke daara n'ala nkume bụ ndị na-anụ okwu ahụ, nabatakwa ya n'ọṅụ, mana ha enweghị mgbọrọgwụ. Ha kweere naanị nwa oge, mana mgbe oge ọnwụnwa bịara, ha wee dachapụ. Mkpụrụ ahụ nke daara n'etiti ogwu bụ ndị na-anụ, mana nsogbu na akụ na ụba, na ikpori ndụ bịara kpagbuo okwu ahụ. Ọ dịghị mgbe ọ mịrị mkpụrụ. Mkpụrụ ahụ nke daara n'ala ọma bụ ndị na-anụ okwu ahụ, nabatakwa ya n'obi ọma na nrube isi. Ha na-anọgide ruo mgbe ha mịrị mkpụrụ. Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna kpuchie ya akwa, ma ọ bụ dọba ya n'okpuru ihe, kama ọ na-adọba ya n'elu ihe. ...Ka mmadụ niile wee hụ ihe mgbe ha na-abata. A ga-eme ka ihe ọbụla zoro ezo pụta ihe... ...A ga-ekpuhepụkwa ihe ọbụla ekpuchiri ekpuchi. Kpachapụ anya maka ihe Ị na-anụ, n'ihi na a ga-enye onye ọbụla nke nwere: mana onye ọbụla nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ole na ole o nwere. Onye nkụzi... ...Nne gị na ụmụnne gị na-achọ gị n'ezi, ha na-achọ ịhụ gị. Nne m na ụmụnne m bụ ndị na-anụ okwu Chineke na-emekwa ya. Otu ụbọchị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere n'ụgbọ, ọ sị ha, "Ka anyị gafee n'ofe osimiri nke ọzọ." Mgbe ha na-eje, Ọ malitere ihi ụra. Onye nwe anyị! Onye nwe anyị! Jisọs! Ọ bụ ọnwụ ka anyị na-anwụ! Ebili mmiri na-amagharị, mmiri ga-agbagbu anyị! Zọpụta anyị, onye nwe anyị! Anyị ga-enwe nzọpụta! Ebee ka okwukwe unu dị? Ha wee gafee n'ofe osimiri ahụ ruo Gadara, nke nọ na ncherịta ihu Galili... Jisọs, Ọkpara Onye Kachasị ihe niile elu. gịnị ka Ị chọrọ n'ebe m nọ? Biko, atala m ahụhụ! Gịnị bụ aha gị? Legion. Onye nwe anyị, biko atụbala anyị n'ọdọ ọkụ, kama ziga anyị n'igwe ezi a. Chei! Lọghachinụ! Kwụsịnụ! Kwụsịnụ! Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee pụọ n'ime nwoke ahụ... Lọghachinụ! ...baa n'ime igwe ezi ahụ. Si n'ebe a pụọ! Onye amusu, hapụ anyị! Si n'ebe a pụọ! Nye efe! Pụọ site n'ebe a! M ga-esoro gị jee ebe Ị na-eje. Biko, ka m soro gị jee. Laghachi n'ụlọ gị, gwa ha ihe ọma Chineke meere gị. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya wezụgaara onwe ha ruo Betsaida. Igwe mmadụ nụrụ ihe banyere ya, wee soro ya. Mgbe ụbọchị gawara Pita sịrị ya... Onye-ozizi, zilaa igwe mmadụ ndị a, ka ha wee nwee ike ịba n'ime obodo... n'ubi ndị dị nso ebe a, chọọ ihe oriri na ebe ha ga-n'ezie, n'ihi na ebe a bụ ọzara. Were nụ nri nye ha n'onwe unu. Mana ọ bụ nanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nweere. Ngọzi dịrị gị, onye nwe-anyị Chineke, Eze nke ụwa dum, onye wepụtaara achịcha a saịtị ahụ. Ọ bụ ọlụ ebube! Ihe ịtụnanya! Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ? Ụfọdụ na-asị na Ị bụ Jọn nke Baptism. Ndị ọzọ na-asị na Ị bụ Elaija, ụfọdụ na-asịkwa na Ị bụ otu n'ime ndị amụma ochie, nke loghachikwara na ndụ ọzọ. Kedụ maka unu onwe unu? Onye ka unu sị na m bụ? Ọ bụ Gị bụ Mesaia! Unu agwala onye ọbụla nke a. Nwa nke Mmadụ ga-ata ahụhụ, aga-ajụkwa ya. Aga-egbu ya, mana ọ ghaghị ibilikwa ọzọ n'ụbọchị nke atọ. Onye n'ime unu ga-esoro m jee? M ga-esoro gị, onye-ozizi. Mana biko chere ka m jee sị ezi-na-ụlọ m, "ka-emesịa." Onye ọbụla nke maliteere ọlụ, nke na-elekwa anya n'azụ, enweghị oke ọbụla n'ala-eze Chineke. Onye ọbụla nke na-achọ isoro m, ga-ajụ onwe ya... ...buru kwa obe ya na-eso m, kwa ụbọchị. N'ihi na onye ọbụla nke ga-echebe ndụ ya ga-atufu ya.. Mana onye ga-atufu ndụ ya n'ihi m, ga-achọta ya. Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ irita ụwa dum n'uru, ewee napụ ya ndụ ya? Onye ọbụla nke ihere m, na nke ozizi m na-eme, ihere onye ahụ ga-eme kwa Nwa nke Mmadụ mgbe Ọ ga-alọghachi n'ebube ya. N'ebube nke Nna ya na ndị mmụọ-ozi. N'ezie asị m unu ọ dị ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire n'etiti unu ruo mgbe ha ga-ahụ ala-eze Chineke. Jisọs wee kpọrọ Jọn, James na Pita jee n'elu ugwu ikpe ekpere. Mgbe ọ na-ekpe ekpere, ihu ya gbanweere, uwe ya bidokwara ịcha ọcha, udidi ya gbanwekwara. N'otu ntabi anya ahụ mmadụ abụọ maliteere ịgwa ya okwu. Ha bụ Mosis na Elaija, ndị pụtaara n'ebube nke elu-igwe Ị ga-emezu uche Chineke. Ị ga-anwụ na Jerusalem. Mgbe ha na-akwado ịpụ, Pita sịrị Jisọs: Onye-ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ n'ebe a. Anyị ga-ewu ụlọ-ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị... Mgbe Pita ka na-ekwu okwu, igwe ojii wee kpuchie ha, egwu tụrụ ndị na-eso ụzọ ya; olu wee si n'elu-igwe daa sị: "Nke a bụ okpara m, onye arọputaara, nụrụ nụ olu ya." Onye-nkụzi! Onye-nkụzi! Biko arịọm gị lebara nwa m anya. Biko, biko nyere m aka. Ọ bụ nanị otu nwa m nwere. Agwara m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmuọ ọjọọ a. Mana ha enweghị ike. Ndị okwukwe-nta na ọgbọ ihe Daalụ. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ. Kpọtara m nwa gị... Agwọwokwa ya! Ọlụ ịtụnanya! Kuziere anyị ikpe ekpere, dịka Jọn ziiri ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe unu na-ekpe, kpee nụ sị: Nna anyị nke bi n'eluigwe... Ka-edoo aha gị nsọ, Ka ala-eze gị bia… Ka emee ihe ị na-achọ n'ụwa dịka esi eme ya n'eluigwe... Nye anyị nrị ga-ezuru anyị n'ubọchị taa... Gbaghara anyị mmehie anyi, dịka anyị agbaghara ndị ji anyi ụgwọ... Edubala anyị n'ime ọnwụnwa. Kama zọpụta anyị n'aka ihe ọjọọ." Rịọ nụ unu ga-arịọta, Chọọ nụ, unu ga-achọta, kụọ nụ, aga emehere unu. N'ihi na onye na-arịọ na-arịọta. Onye na-achọ na-achọtakwa, onye na-akụ aga-emeghere ya. O nwere onye bụ nna n'etiti unu nke na-enye nwa ya ạgwọ mgbe ọ rịọrọ ya azụ, ma ọ bu akpị mgbe o rịọrọ ya akwa? Ọ bụ ezie na unu dị njọ, mana unu na-enye ụmụ unu ezi ihe. Ọ bụ na Chineke nke bi n'eluigwe agaghị enye unu mmụọ-Nsọ karịa, bụ ndị na-arịọ ya? N'ezie asị m unu: Unu echegbula onwe unu n'ihe unu ga-eri. Ma ọ bụ ihe unu ga-eyi; n'ihi na ndụ kariri nrị, na ihe ana-eyi n'arụ. Lee nnụnụ, ha anaghị agha mkpụrụ, ha anaghị ewe ihe ubi, ha enweghị ọba, mana Chineke na-azụ ju ha afọ. Ọ bụ unu amaghi na unu di oke ọnụ ahịa karịa nnụnụ? Onye na-echegbu onwe ya, ọ puru itinye ndụ n'elu ndụ ya? Ọ bụrụ na unu enweghị ike ime nke a, gịnị mere unu na-echegbu onwe unu? Lee, ahịhịa ha na-eto nke ọma, Ha anaghị adọgbu onwe ha... Obụna Solomon n'ebube ya niile amaghị mma dịka ahịhịa ndị a. Ọ bụrụ na Chineke ga-achọ ahịhịa mma, nke ga-adị taa, echi atụba ya n'okụ, kedụ maka unu nke ka ha oke ọnụ ahịa, unu ndị okwukwe nta? Mee ka okwukwe anyị hie nne. O bụrụ na unu nwere okwukwe dịka mkpụrụ mostad, unu nwere ike ịsị ukwu-osisi a: "Bupu onwe gi n'ebe a, gaa n'akụkụ osimiri" n'ezie o ga-adikwara unu otu ahụ. Onwụnwa aghaghị ịbịa n'ụwa. mana ahụhụ ga-adịrị onye ọ ga-esi n'aka ya bịa. Ọ ga-akara ya mma, ma ọ bụrụ na aga-eke ya nkume n'olu, tụba ya n'osimiri, karịa na ọ ga-eme ka otu onye n'ime ndị a mehie. Gịnị ka ala-eze Chineke yiri? O yiri: Nwoke weere mkpụrụ mọstad kụnye ya n'ubi. O wee tolite, ghọọ ukwu-osisi, anu-ufe nke eluigwe n'ezukwa ike n'elu ya. Ihe ọ na-ekwu edoghi m anya. Gini mere gị na ndị ọna-ụtụ, ndị mmehie na ndị ajụrụ ji erikọ nrị? Mkpa dibie anaghị akpa onye ahụ dị ike, kama onye ọrịa. Abiaghi m ikpọ ndi amaara aha ha ka ha chegharia... ... kama, ndị mmehie. Gwa anyị ọzọ ihe banyere ala-eze. Biko ọ nwere ihe ọzọ? Atụla egwu, ụmụ atụrụ m n'ihi na ọ masịrị Nna unu inye unu Ala-eze ya. Ree nụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Kwadoro nụ onwe unu akụ nke na-enweghị mmebi, kwado nu akụ unu n'eluigwe, n'ebe ha agaghi atalata... N'ihi na ndị ohi anaghị aga ebe ahụ, nla na nchara agaghịkwa emebi ya... N'ihi na N'ebe akụ gi di ka obi gi ga-adịkwa. Nwanyị, I nweerela onwe gi site n'ọrịa gị. Lee! Lee! Agwọọla ya! Ọlụ-ebube! Lee, agwọọla ya! Bịa nụ lee! E-E-Ekele dịrị Chineke! Afọ iri-na-asatọ. Chineke debe gị, onye-ozizi! O di mkpụrụ ụbọchi isii nke anyị nwere ịlụ ọlụ, bịa n'ubochi ndi a ka agwọọ gị, ọ bụghi n'ụbochị Sabat. Unu Ndị ihu abụọ! O bu onye n'ime unu bụ onye na-adighi eduba ịnyịya-ibu ya n'ebe iṅụ mmiri n'ụbọchi izu-ike? Onye a bụ nwa Abraham nke ekwensu kere agbụ afọ iri-na-asatọ, ndị a. O bụ na agaghi eme ka ọ dị ike n'ubochi izu-ike? Ezi onye-ozizi, Gịnị kam ga-eme ịketa ndụ ebighi ebi? Gịnị meere I jiri kpọọ m ezi-onye? Ọ dịghị onye dị mma ma ọ bughi Chineke. Ị maara iwu nile. Akwala iko, egbula mmadụ, ebola mmadụ ebubo ụgha, sọpụrụ nna gị na nne gị. Mana a na m edebe iwu ndị a site na nwata m. O nwere otu ihe nke fọdụrụ gị ime. Ree ihe niile Ị nweere, nyekwa ndị ogbenye, Ị ga-enwekwa akụ n'eluigwe. Bịakwa soro m. Mana anyị bụ ndị na-azụ ahịa Ọgaranya. N'ezie ọ dirighi ogaranya mfe ịba n'Ala-eze Chineke. Ọ dịịrị ịnyịnya-ibu mfe ịgafe site n'anya agịga, karịa ogaranya ịba n'ala-eze Chineke. Ọ bụkwa nụ onye ka apụrụ izọpụta? Ihe ana-apụghi ime n'ebe mmadụ nọ, di mfe ebe Chineke nọ! Ebee, nnoo ka ọ ga-adị, bụ Ala-eze ehh? Ala-eze Chineke anaghị abịa otu aga-esi hụ ya anya. Ọ dịghị onye ga-asị: "Lee, ebe a ka ọ dị," ma ọ bụ, "Ebe ahụ ka ọ dị." N'ihi na unu na Ala-eze Chineke nọ. Oge na-abịa mgbe ọ ga-adị unu ka unu hụ ụbọchị nke onye-nwe-anyị anya, mana unu agaghị ahụ ya. Dịka amụma mmiri na-amụ n'elu, dịka ọ na-emekwa ka ihe dị site n'otu akụkụ ruo akụkụ ọzọ otu a ka ụbọchi nke Nwa-nke-mmadụ ga-adị. Mana, ọ ga-ebu ụzọ taa ahụhụ, ndị ọgbọ a ga-ajụkwa ya. Ọ dị karịrị mfe ka eluigwe na uwa gabiga, karịa na okwu nta niile nke Chineke aghaghị emezu. N'ezie ọ gụsiri ndị amụma na ndị eze ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe unu na-anụ ugbu a, mana ha enweghị ike ya. Gịnị ka anyị ga-eme? Gịnị ka akwụkọ-nsọ na-ekwu? Kedụ nkọwa Ị ga-enye ya? Hụ onye-nwe-anyị n'anya site n'obi gị dum; Werekwa mkpụrụ obi gị dum, n'ike gị dum, na uche gị dum, hụ onye-agbata obi gị n'anya dịka onwe gị. I kwuru nke ọma. Mee otu a, Ị ga-adị ndụ. Onye bụ onye-agbata-obi m? Ọ bụghị ndị-agha a. Kedu maka Siza? O nwere otu nwoke nke sitere Jerusalem na-aga Jeriko. Ọ wee daba n'aka ndị ohi ndị gbara ya ọtọ, tikwaa ya ihe, hapụ ya ọdị-ndụ-ọnwụ-ka-mma. Otu onye nchụ-aja wee gafeta n'ụzọ ahụ. Mgbe ọ hụrụ nwoke a. O siteere n'ụzọ ọzọ gabita… Otu aka ahụ, onye Livai, mgbe ọ bịaruru ebe ahụ, hụkwa ya, O sitekwara n'akụkụ ụzọ ọzọ gafee. Mana otu onye Sameria nke nọ n'ije, mgbe o ruru ebe ahụ, ọ hụ nwoke ahụ. O nwere obi omiko n'arụ ya. O wee bịaruo ya nso, tee ọnya ya niile mmanụ kekwaa ya ihe okike. O wee kukwasi ya n'inyinya-ibu ya, kpọrọ ya debe n'ụlọ ndị ije, nyekwa onye-nlekọta ụlọ ahụ ego. Gwakwa ya ka o lekọta nwoke ahụ anya. Ọ gwakwara ya na ya ga-akwụghachi ya ihe niile ọ ga-emefu n'isi nwoke ahụ-mgbe ọ ga-alọghachi. Onye n'ime mmadụ atọ a bụ onye-agbata obi nwoke a nke dabaara n'aka ndị ohi? Onye ahụ nke meere ya ebere. Gaa, mee otu ahụ. Kwenụ ka ụmụ-ntakịrị bịakute m, unu egbochikwala ha, n'ihi na Ala-eze Chineke bụ nke ndị dị otu a. N'ezie asị m unu, onye ọ bụla nke na-agaghị anara ala-eze Chineke dịka nwatakịrị, ọ gaghị aba n'ime ya ma ọlị. Onye ọ bụla nke kpọbatara nwata a n'aha m na-akpọbata mụ onwe m Onye ọbụla nke kpobatara mu onwe m nakpọbata onye zitere m. Onye dịkarị sịrị nta n'ime unu bụ onye kachasị ukwuu. Chei! Gịnị na-eme? Gini na-akpọtụ? Jisọs nke Nazaret, na-agafe. Jisọs! Jisọs! Nwa nke Devid! Meere m ebere? Gịnị ka Ị chọrọ ka m meere gị? Achọrọ m ịhụ uzọ ọzọ. Hụ ụzọ. Okwukwe gị agwọwo gị. Ahụwala m ụzọ. Ahụwala m ụzọ! Ahụwala m ụzọ! Mgbe Jisọs na-eje Jerusalem, igwe mmadu bịakutere ya; ha na-arịọ ya ka o zi ha ụzọ nzọpụta. Ha Chọkwara ka ọ gwa ha karịa ihe banyere ala-eze Chineke. Nwoke a bụ nnọọ onye-amụma! Onye-nwe m, zọpụta m! Jisọs, zọpụta anyị, zọpụta anyị! Too nu Chineke! Onye-nwe anyị, zi anyị ezi ụzọ! Ndị mmadụ ebidola ịnabata ya dịka onye-ozizi na onye-nwe ha. Na Jeriko, o nwere otu onye ọna-ụtu ana-akpọ Zakịọs. O rigooro n'elu osisi ka o wee hụ Jisọs n'ihi igwe mmadụ. Onye a bụ ọna-ụtụ. Rịdata Zakịọs, mụ na gị ga-anọ n'ulọ gị taa. N'ụlọ m?! Onye ga-achọ ịnọ n'ụlọ ya? Kẹdụ otu Zakịọs ji mara Jisọs? Gee ntị: M ga-enye, ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. O bụrụ na, onwere onye m ghọgbuuru... M ga-akwụghachi ya, ugboro anọ! Nke a agaghị ekwe omume! Onye-ọna-ụtụ ime ihe dị otu a? Ụgha! Taa ka nzọpụta bịara n'ụlọ a, n'ihi na nwoke nke a bukwa nwa nke Abraham! Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na izọpụta ndị furu efu. Gee nụ ntị: Anyị na-eje Jerusalem, ebe amụma niile eburu banyere Nwa-nke-Mmadu ga-emezu. A ga-arara ya nye n'aka ndị mba ọzọ. Ha ga-achị ya ọchi, mee ya ihe ihere, gbụkwaa ya asụ n'iru. Aga-apịakwa ya ụtarị, gbukwaa ya. Mana ọ ghaghị ibilite n'ọnwụ, 'n'ụbọchị nke atọ... Ọ bụ ezie na Jisọs maara na aga-egbu ya maka mmehie ụwa, o jeere Jerusalem. Ọtụtụ mmadụ ṅụrịrị oṅu n'ọbịbịa ya; ha mekwaara ya eze ha. Onye-ozizi, gwa ndi na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ. N'ezie, ọ bụrụna ha mechie ọnụ. nkume ndị a ga-na-eti mkpu n'ime onwe ha. Udo, Nsọpụrụ, Ahụ-ike. Udo dịrị gị, onye-nwe-anyị. Mgbe Jisọs bịaruru nso Jerusalem, hụkwa ya, ọ kwara akwa maka ya... Ọ bụdụ na ọ bụ taa ka unu maara ụzọ udo, ma unu apụghị ịmara Oge na-abịa mgbe ndị iro unu ga-echi unu ọnụ n'ala, na-emesikwa unu ike n'akụkụ niile. Ha ga-emebi unu, na mgbidi unu niile. Unu na ụmụ unu, ha agaghị ahapụ otu nkume n'elu nkume ibe ya; n'ihi na unu aghọtaghị ụbọchị nleta unu. Ụlọ nsọ Chineke na Jerusalem aghọọla ebe a na-azụ ahịa, karịa ebe ikpere Chineke. Ise, isii, asaa, asatọ, itolu, iri... Edewo ya sị: "Ụlọ nna m bụ ụlọ ekpere," mana unu emewo ya ka ọ bụrụ ọgba ndị ohi. N'atụrụ m, Gbochie nụ ya! Gbochie nụ ya! Kpọ nụ ndị nche! Kpọ nụ ndị nche! N'ihi na igwe mmadụ ahụ malitekwara ịkpọ Jisọs eze. Aghọtara m na ọtụtụ ndị emewo ya rị eze. Eze? Eze ndị arịrịọ, ndị akwụna na ndị ohi. Anyị ahụla ụdị ya mbụ, ndị sị na ha bụ ihe ha na-abụghị, ha nwụrụ, echefuo ha. Unu elefukwala ihe a anya. Ndị na-eso ya na-abawanye kwa ụbọchị. Ihe ya na-adị ha mma... ...na-eche na ọ bụ eze Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ nwoke a gagharịa nye anyị nsogbu ọzọ, ọ bụ unu ka m ga-ejide. O kwuru eziokwu. Oge eruola mgbe anyị ga-agwa nwoke Galili a okwu. Ebe ọ na-ekwujọ ndị ihu abụọ, nke bụ, ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ, ...ndị na-eso ụzọ ya bawanyere n'etiti ndị Juu. Ndị o kwujọkwara maliteere imegide ya. Mgbe Jisọs nọ n'ụlọ ukwu Chineke, ọ hụrụ nwanyị di ya nwụrụ ka o na-enye onyinye... Ọ bụ na Ị nweghị ike inye karịa? N'ezie, nwanyị a nyere karịa ndị ọzọ nyere onyinye ha. N'ihi na ndị ọzọ nyere site n'akụ na ụba ha... Mana, nwanyị a nyere ihe niile o jiri biri, n'agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ya. Gwa anyị... ...ikike gịnị ka Ị nwere ikwu ihe ndị a? Onye nyere gị ikike a? Ka m jụọ unu ajụjụ: Ike Jọn nke Baptism, o sitere n'aka mmadụ, ka ọ bụ n'aka Chineke? Gịnị ka anyị ga-ekwu? Ọ bụrụ na anyị asị na ọ bụ na Chineke, Ọ ga-ajụ sị, "Gịnị mere, unu ekweghị na ya?" Ọ bụrụ na anyị asị n'aka mmadụ, igwe mmadụ a ga-atụ anyị nkume, N'ihi na ha niile maara na Jọn bụ onye amụma. Anyị amaghị n'ebe ikike ya si bịa. Otu aka ahụkwa, m gaghị agwa unu onye nyere m ikike ime ihe ndị a. O nwere otu nwoke nke kụụrụ ubi vaịnị, werekwa ya nyefee n'aka ndị egoro ọrụ... ...wee jee ala ọzọ nọdụ ogologo oge. Mgbe oge ruru maka ịghọ mkpụrụ vaịnị o zigara otu n'ime ndị ọrụ ya, ka ha nye ya ụfọdụ n'ime mkpụrụ ubi ahụ. Mana ndị ahụ egoro ọrụ pịara ya ụtarị, zilaa ya n'aka efu. O wee zigakwa ọrụ ọzọ... ...Ndị ahụ egoro ọrụ pịara ya ihe, mee ya ihe ihere, zilaa ya na-enyeghị ya ihe ọbụla. O wee ziga ọrụ nke atọ, mana ha pịachara ya ụtarị chụpụkwa ya. Onye nwe ubi vaịnị ahụ wee sị onwe ya: "Gịnị kam ga-eme? M ga-eziga nwa m hụrụ n'anya... ...n'ezie ha ga-ege ya ntị." Mana mgbe ndị egoro ọrụ hụrụ ya, ha sịrịta onwe ha: "Nke a bụ nwa onye-nwe ubi ahụ. ...Ka anyị gbuo ya, ubi a ga-abụ nke anyị." Gaa n'ihu! Ha wee kpụrụ ya pụọ, wee gbuo ya. Gịnịkwa ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ndị ahụ egoro ọrụ? Ọ ga-abịa gbuo ha, werekwa ubi ahụ nyefee ndị ọzọ n'aka. Kedụ ihe nkuzi a pụtara? Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, nke ahụ ka e meere isi nkuku ụlọ. A ga-etipịasị onye ọ bụla nke dakwasịrị nkume ahụ, ma onye ọ bụla ọ ga-adakwasị, ọ ga-efesasịkwa ya dịka uzuzu. Onye-nkụzi... ...anyị maara na ihe Ị na-ezi na nke Ị na-ekwu ziri ezi. Anyị makwaara na Ị naghị ele mmadụ anya n'ihu. Mana Ị na-akụzi ihe bụ uche Chineke banyere mmadụ. Biko, gwa anyị ma o ziri ezi n'iwu, ị na-atụ ụtụ, nye ndị na-achị Rom? Lezie anya, onye-nwe-anyị, ọ na-achọ ịghọgbu gị. Gosi M ego unu. Ọ bụ onye ka ihu ya na aha ya dị ya? Siza! Ya mere, nye Siza, ihe nke dịrị Siza; Nyekwa Chineke, ihe nke dịrị Chineke! Gịnị bụ ọsịsa ụnụ maka nke a? Ugbu a, ememe achịcha ekoghi eko na-abịaru nso. Nke a na-akpọ ememe ngabiga. Jisọs wee ziga Pita na Jọn idoziri ha ebe ha ga-anọ mee ememe ahụ. Ọ masịrị m isoro unu mee ememe a tupu oge ịta ahụhụ meruo. N'ihi na agaghị m esoro unu rie ya ọzọ ruo mgbe unu ga-amata ihe ọ bụ n'ala-eze Chineke. Ngọzi na-adịrị gị onye-nwe anyị, Eze nke ụwa niile, onye siteere na vaịnị wepụta mkpụrụ ya. Were nụ nke a, kee nụ ya n'etiti onwe unu. N'ihi na agaghị m aṅụkwa site na vaịnị a ọzọ, ma ọ bụghị n'ala-eze Chineke. Ngọzi na-adịrị gị, onye-nwe anyị, Eze ụwa niile, onye na-esite n'ala wepụta achịcha. Nke a bụ arụ m nke a na-enye n'ihi unu. Na-eme nụ nke a ka unu wee na-echeta m. Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụụ nke ọbara m, nke awụsịrị n'ihi unu. Ma lee, onye ga-arara m nye na-esoro m rikọọ nrị. N'ezie, Nwa nke Mmadụ aghaghị ịnwụ dịka Chineke siri chọọ ya, mana ahụhụ ga-adịrị onye ga-arara ya nye. Nke a agaghị eme. O meghị eme! O meghị eme! Gwa anyị onye ọ bụ, onye-nwe anyị. Onye kachasị ukwu n'ime unu aghaghị ịdịkarịsị nta. Onye ndu aghaghị ịdị ka onye ozi Ọ bụ onye karịrị ibe ya, onye a na-efe, ka ọ bụ onye na-efe mmadụ? N'ezie, ọ bụ onye a na-efe. Mana anọ m n'etiti unu dịka onye ozi. Mụ na unu nọ n'ahụhụ m niile. Dịka Nna m nyere M ikike ịchị achị, otu a kwa M ga-enye unu ikike ịchị. Mụ na unu ga-erikọ nrị n'ala-eze M. Unu ga-anọkwasịkwa n'oche-eze ịchị ebo iri-na-abụọ nke Izrel. Nke bụ na ọ dịghị onye ga-arara gị nye. Saịmọn, Saịmọn, lee… Ekwensu na-achọ ịnwa unu, iwezuga ndị ọjọọ site na ndị ọma, dịka a na-ewezuga igbugbo ọka site n'ọka. Mana ekpeela m ekpere banyere gị, Saịmọn, ka okwukwe gị ghara ịda, ka mgbe Ị ga-alọghachikwuru m, Ị wee gbaa ndị ọzọ ume. Onye-nwe anyị... ...Ejikeere m isoro gị jee mkpọrọ... isoro gị nwụọ. N'ezie, Pita... ...tupu oke-ọkụkọ ebee akwa taa, Ị ga-agọnarị m ugboro atọ sị na ị maghị m. Mgbe m zipụrụ unu na-ejighị ego, na akpụkpọ ụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu? Mba, ọ dịghị. Mana ugbu a, onye nwere akpa-ego, ya were ya, mana onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya zụta otu; N'ezie ihe edere n'Akwụkwọ Nsọ aghaghị imezu: "Ọ bụkwa n'etiti ndị na-emebi iwu ka a gụnyere ya." Ihe niile edere banyere m na-abịa na mmezu. Lee, mma-agha abụọ, onye-nwe anyị. Ghara ihe ahụ. Ndị okenye wee zukọọ ịchọ otu ha ga-esi wepụ Jisọs. Ekwensu wee banye n'ime Jụdas Iskarịọt, nke bụ otu n'ime ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ya na ndị okenye gbara izu otu a ga-esi jide Jisọs. Jisọs jeere Ugwu Olive ikpe ekpere. Kpee nụ ekpere ka unu ghara ịdaba n'ime ọnwụnwa. Ọ bụ nanị iri mkpụrụ ego atọ ka e rere Jisọs. Jisọs matara na oge ọnwụ ya maka mmehie mmadụ niile abịala nso; o wee na-ekpe ekpere. Nna, Ọ bụrụ na ọ bụ uche gị. wepụ iko a n'ebe m nọ. Mana, otu ọ dị, ọ bụ uche gị ga-eme, ọ bụghị nke m. Mmụọ-ozi wee bịa site n'eluigwe ịgba ya ume. Ajịrịja na-agba ya n'ahụ, na-adapụsị n'ala dịka ọbara. Gịnị meere unu na-ehi ụra? Bilie nụ! Na-ekpe nụ ekpere ka unu ghara ịdaba n'ọnwụnwa... Judas! Ọ bụ site na nsutu-ọnụ ka Ị na-arara nwa-nke mmadụ nye? Onye-nwe anyị, ọ bụ anyị lụọ ọgụ? Ngwa, jide nụ ya! Ozuola! Ọlụ ebube. Unu ji osisi na mma-agha abịakute m dịka na m bụ onye ohi? Mụ na unu nọ kwa ụbọchị n'ụlọ-ukwu Chineke, mana unu ejideghị m. Ugbu a bụ oge unu, ime ihe oge ike ọchịchịrị ga-achị. Jide nụ ya! Jidesie nụ ya ike. Ndị agha wee duru ya jee n'ụlọ ikpe, ebe emere ya ihe ọchị, na-akpọkwa ya eze ndị Juu. Nke a bụ uwe onye eze na-eyi! Gwa anyị ihe gaje ime. Ị ga-azọpụta anyị, onye-eze? Ọ bụ gị ga-azọpụta anyị? Nwoke a na-esokwa ụzọ Jisọs. Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ. Ahụrụ m ya na ya. Ndị ọrụ...gị. Kedụ otu ọ dị bụ ilekwasị mmadụ anya? Ị bụ otu onye n'ime ha. Mana a bụghị m. N'ezie ọ dịghị ihe iju anya dị ya, nwoke a na Jisọs nọrịị. Ọ bụkwa onye Galili. Nye efe! A maghị m ihe Ị na-ekwu okwu banyere ya. Jisọs wee tụgharịa lee Pita anya. Pita wee cheta ihe Jisọs gwara ya. "Tupu oke-ọkụkọ ebee akwa, Ị ga-agọnarị m ugboro atọ." Nna... anyị arịọ gị, mee dịka Ị sịrị dị, dịka ike gị niile sịrị dị. Gị, onye gbaghaara nna anyị ha mgbe ha mehiere gị Gị, onye wesara ha iwe, mana Ị bibighị ha. N'ihi ịhụnanya Ị nwere n'ebe ha nọ, n'ihi ọgbụgba-ndụ gị, gbagharakwa m. Onye tiri gị ihe? Gwa anyị, onye ọzọ ga-eti gị ihe. Kwụsị nụ ya! Asị m unu kwụsị ya! Kpọta nụ ya n'ụlọ ikpe. Ngwa! Ndị okpukpe ndị Juu wee zukọọ ịjụ Jisọs ajụjụ. Gwa anyị, Ị bụ Mesaịa? Ọ bụrụ na m gwa unu, unu agaghị ekwere. Ọ bụrụkwa na m jụọ unu ajụjụ unu agaghị asa m ya. Mana site taa, nwa nke mmadụ ga-anọdụ ọdụ n'aka nrị nke Chineke. Ị bụ nụ ọkpara Chineke? Unu onwe unu kwuru, na m bụ. Onye nyere ya ikike ikwu otu ahụ. Ikpe mara ya! Anyị onwe anyị anụla ihe o kwuru. Anyị ga-akpọjere ya Pailet. E, Ọ bụ ezie, kpụpụ nụ ya! Ngwa! Ha wee duru ya jekwuru Pailet, onye kachasị njọ n'etiti ndị ọchịchị Rom, nke esiteere n'aka ya kpọgide ọtụtụ ndị mmadụ n'obe. Gịnị ka unu chọọrọ ebe a, n'isi ụtụtụ a? Anyị jideere nwoke a ka o na-eduhie ndị anyị! O weteere nsogbu n'ahịa dị n'ụlọ-ukwu Chineke! Gịnị ga-abụ ahụhụ ya? Maa ya ikpe! Ọ dịghị ihe m hụrụ o mere m ga-eji maa ya ikpe. Ọ bụ onye mmebi iwu. Ọ gwara ha ka ha ghara ịtụ ụtụ nye Siza. Ọ sịkwara na ya bụ Mesaịa, na eze. Eze? Ị bụ eze ndị Juu? Gị onwe gị kwuru. O bidoro na Galili; ugbu a Ọ bịala ebe a. Na Galili? Ọ bụ onye Galili? Ọ bụrụ na ọ bụ otu a, kpọgara nụ ya Herọd. Ọ kwa ọ ka nọ na Jerusalem? Kpọgara nụ ya Herọd! Ị sịrị na Ị bụ onye? Kedụ ndị bụ ndị na-eso ụzọ gị? Ndị mmadụ sịrị na Ị pụrụ ime ihe ịrịba ama. Meere m ụfọdụ. Onye-nwe m... Ọ nọ na-emebi ndị mmadụ isi. Ọ na-akpọkwa onwe ya... eze. Nwoke a? Eze?! Onye-nwe m. Pịa ya ihe nke ọma! Zigakwara nụ ya Pailet. Ọ bụ ya na-achị ebe a. Nwoke a, emeghị ihe ọ bụla kwesịrị ya ọnwụ. Ya mere, m ga-apịa ya ihe, hapụ ya ka ọ laa. Ị maara nke ọma na ọ bụ iwu na ị ga-ahapụrụ anyị otu onye mkpọrọ, n'ememe a. Hapụrụ anyị, Barabas E. Barabas! Kpọgbuo nwoke a. E, hapụrụ anyị Barabas. Kpọgbuo ya! Kpọgbuo ya! Gị, gị, pịa nụ ya ụtarị! Gịnị ka ị na-eche, Pailet? Ọ bụ Jisọs! Hapụ nụ ya, ọ bụ Mesaịa! Ọ dịghị ihe o mere! Kulie nụ ya! Ha wee na-etisi mkpu ike sị, kpọgbuo ya, kpọgbuo ya. Pailet wee kpee ya ikpe ọnwụ. Ọ hapụkwara Barabas bụ onye ha chọrọ ka a hapụrụ ha. Atụrụ ya mkpọrọ n'ihi na ọ bụ ogbu mmadụ. O wee nyefee ha Jisọs ka a kpọgbuo ya n'obe. Gị! Gịnị bụ aha gị? Saịmọn, nke Saịrini. Bịa n'ebe a! Gbubie eriri ahụ! Gị, buru obe a. Mee ngwa ngwa. Anyị na-akwara gị akwa, onye-nwe-anyị. Ṅụọ, onye-nwe-anyị, ṅụọ... Ṅụọ, onye-nwe-anyị. Ndị inyom Jerusalem, unu akwarala m akwa... ...Mana kwaara nụ onwe unu na ụmụ unu akwa. N'ihi na ọ bụrụ na ihe dị otu a na-eme n'udu mmiri, gịnị ga-eme n'ọkọchị? Chineke nyere gị aka. Anyị ga-ekpere gị ekpere. Mee nụ ngwa! Bulie ya! Tinye nụ osisi ahụ! Wepụ nụ eriri! Nna, gbaghara ha, ha amaghị ihe ha na-eme. Ọ zọpụtala ndị ọzọ... ...ya zọpụta nụ onwe ya. E, zọpụta onwe gị ma ọ bụrụ na Ị bụ Mesaịa! E, si ebe ahụ rịdata. Gosi anyị otu ọlụ ebube gị! Otu a a kpọgidere Jisọs n'obe... ...n'etiti ndị ohi abụọ na mmezu nke amụma, dịka eburu ya n'amụma ọtụtụ afọ gara aga. Nke a abụghị uwe efu, ma otu. E, e, unu adọkala ya. M ga-agwa unu ihe anyị ga-eme. Ka anyị fee nza. A! onye ihu-ọma. Ndị-agha wee fee nza maka uwe ya. Ha wee dee ihe tinye n'isi obe ya sị: "Nke a bụ eze ndị Juu." Zọpụta nụ onwe gị ma ọ bụrụ na Ị bụ eze ndị Juu. Ị bụghị... ...Mesaịa ahụ? Zọpụta onwe gị... ...zọpụta kwa anyị. Ị na-atụkwa egwu Chineke? A mara ya ikpe, dịka amara gị... ...mana, o dịghị ihe ọjọọ o mere. Chetakwa m Jisọs mgbe Ị ga-abịa dịka eze. Ekwe m gị nkwa... Taa, ka mụ na gị ga-anọ na Paradaịs. Ugbu a bụ ehihie, mana ọchịchịrị gbachiri ebe niile hour atọ, ruo elekere atọ, nke ehihie. Akwa mgbochi nke ụlọ-ukwu Chineke wee tiwaa site n'elu ruo n'ala... Nna... n'aka gị... ka m nyefere... mmụọ m. Mgbe onye-isi ndị agha ahụ hụrụ ihe mere, ọ toro Chineke sị: Ekele dịrị Chineke. N'ezie, onye a bụ onye ezi-omume. Josef nke Arịmatịa, onye ezi-omume nke na ekwenyeghị ogbugbu e gburu Jisọs, rịọrọ Pọntiọs Paịlet ka e bunye ya ozu Jisọs ka o lie ya tupu ụbọchị ha ji efe ofufe eruo... Gbaghara anyị. Anyị na-eso ozu onye-nwe anyị. Nsogbu a dịghị, mana, bịa nụ, ụbọchị izu-ike dị nso. N'isi ụtụtụ izu-ụka, ha ji ude-isi ụtọ bịaruo ili ahụ. Ha hụrụ na ebupuwo nkume ahụ site n'ili ahụ Mana mgbe ha baara n'ime ya, ozu Jisọs adịghị ya. Gịnị mere unu na-achọ onye dị ndụ n'etiti ndị nwụrụ anwụ; o biliwo. Cheta nụ ihe ọ gwara unu na Galili: "Aga-arara nwa-nke mmadụ, nye n'aka ndị mmehie aga-egbukwa ya, mana o ga-esi n'ọnwụ bilie n'ụbọchị nke atọ." Gee nụ ntị! Ebupụrụ nkume ahụ. Anyị banyere n'ime ili... ...ozu onye-nwe anyị... ...adịghị ya. Gịnị? Ozu onye-nwe anyị adịghị ya? Mmadụ abụọ wee pụta dịka ndị-mmụọ-ozi. Ha na-amukekwa ka anyanwụ. Ha sịrị anyị: "Gịnị mere unu na-achọ onye dị ndụ, n'etiti ndị nwụrụ anwụ?" Ọ bụ ezi okwu. Kwere nụ anyị, Kwere nụ anyị. Anyị hụrụ ha. Gaa nụ ka unu hụ n'onwe unu. Ili tọgbọọrọ n'efu. Onye-nwe anyị anọghị ya. Ị ga-ekwerịrị, Pita. Jisọs wee mee ka mmadụ abụọ, ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya. Ha jiri obi ụtọ mee ka ndị ọzọ mata. Onye-nwe anyị ebiliwo n'ezie. O gosiri Saịmọn onwe ya. Anyị aghọtaghị na ọ bụ ya, n'okporo ụzọ. Mana mgbe ọ nyawara achịcha, anyị wee ghọta. N'Emaos! Ọ tụrụ n'anya na ọ ga-eje ebe ahụ. Udo dịrị unu! Gịnị mere obi na-alọ unu mmiri? Gịnị mere unu na-enwe obi abụọ? Lee nụ aka m, na ụkwụ m. Hụ nụ na ọ bụ mụ onwe m. Metụ nụ m aka ka unu mata. N'ihi na mmụọ enweghị anụ arụ na ọkpụkpụ dịka mụ onwe m nwere. Ihe ndị a ka m gwara unu maka ha mgbe mụ na unu ka nọ. Sị na ihe niile eburu n'amụma banyere m n'iwu Mosis na n'ọnụ ndị amụma na n'akwụkwọ Abụ Ọma aghaghị imezu. Nke a bụ ihe edere: "Mesaịa ahụ ga-ata ahụhụ, ọ ga-ebilikwa n'ụbọchị nke atọ... ...N'aha ya ka a ga-ekwusa oziọma nke nzọpụta na nke mgbaghara mmehie, nye mba niile, bido na Jerusalem." Unu onwe unu bụ ndị ma ihe ndị a; mụ onwe m na-eweta nkwa nke Nna m nye unu. Mana unu ga-echere na Jerusalem ruo mgbe ike ga-esi n'elu bịakwasị unu. Ka Chineke gọzie, ma chebekwa unu. Enyewo m ike niile nke dị n'eluigwe na nke dị n'ụwa. Ya mere, gaa nụ na mba niile, zisaa oziọma, na-emekwa ha baptism n'aha Nke Nna na, nke Ọkpara na Mmụọ-Nsọ. Na-ezikwa ha idebe ihe niile m nyere n'iwu; lee ana m anọnyere unu, ruo ọgwụgwụ Amen. Ogologo oge gara aga, ndị amụma dere n'Akwụkwọ Nsọ, na Chineke ga-ezite Onye Nzọpụta. ka ọ zọpụta ndị mmehie ma mee ka ha na Chineke dị n'udo Ndụ Jisọs gosiri nke ọma n'ezie na ọ bụ Onye Nzọpụta onye Chineke kwere nkwa izite n'ụwa. Onye amụma Aịsaịa dere na otu agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụ nwoke, o mezuru dịka o kwuru. Chineke sitere n'ike Ya mee ka Meri tụrụ ime, mụkwa Jisọs. Dịka edere n'Akwụkwọ Nsọ, ọmụmụ nke ịrịba ama ya bụ akara nke Chineke, na nwa ahụ bụ Onye Nzọpụta, onye Chineke kpọrọ nwa Ya. Mgbe ndị mmadụ hụrụ Jisọs, ha nwetara ụdịdị na ike nke Chineke. Ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa ma gbaghara ha mmehie ha, o kwere ha nkwa ọnọdụ n'alaeze ya dị ebighị ebi. Jisọs jiri ndụ ya chụọ aja ma hụkwa ahụhụ mmadụ niile ma o siri n'ọnwụ bilie, igosi na ike ya karịrị ike nke ọnwụ. Jisọs Onye Nzọpụta sịrị, enwere m ike inyefe ndụ m, n'ike iwere kwa ya ọzọ. Ndụ Jisọs dị nnọọ otu ahụ ndị amụma dere ya, na ndụ Mesaịa ga-adị. Ndụ ya kwadoro n'okwu nke ndị amụma bụ eziokwu na nke na-adịghị agbanwe. Dịka ndị amụma kwuru ya, "Okwu nke onye-nwe anyị adịghị agha agha." Okwu gị na-adị ruo ebighị ebi. Mesaịa ahụ n'onwe ya sịrị, "Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu niile nke ọnụ m agaghị agabiga ma ọlị." Na mbido, Chineke kere nwoke na nwanyị, ka ha na Chineke nwekọọ ihe. Ma ha atụkwasịghị Chineke obi, ha nupụrụ isi n'iwu Ya. Omume a kewapụrụ ha n'ebe Chineke nọ. N'ime Akwụkwọ Nsọ, edere ya na "Mmadụ niile emehiewo." Ma "Ụgwọ ọrụ nke mmehie ahụ bụ ọnwụ." Ndị mmehie apụghị ịdị ndụ n'ime mmekọrịta ha na Chineke. Ma dịka Chineke họpụtara ebule ịnwụ n'ọnọdụ nwa Abraham, otu a o zitere Jisọs bụ Onye Nzọpụta ka ọ nwụọ n'ihi ụmụ Adam. Ndụ ya, ọnwụ ya, na mbilite n'ọnwụ ya, weghachiri mmekọrịta n'etiti Chineke na ndị na-atụkwasị Ya obi. Onye ozi Pita sịrị: "Jisọs bụ nanị otu onye ahụ, ndị amụma niile kwuru sị, na Chineke ga-agbaghara mmehie nke ndị niile kwere na ya." N'ihi nke a ndị niile sooro Jisọs ga-agbanarị ahụhụ nke ọkụ ala mmụọ ma soro Chineke na-ebi n'alaeze Ya ruo ebighị ebi. Mgbe Jisọs siworo n'ọnwụ bilie, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Ndị mmadụ ga-ekwusa n'aha m nye mba niile, na Chineke na-agbaghara mmehie nke ndị nwere nchegharị." Jisọs kwuru sị na ya ga-ezite Mmụọ Nsọ ka o binyere ndị na-eso ụzọ ya, ịkụziri ha eziokwu na inye ha ike isoro ụzọ nke Chineke. Mgbe nwanyị mmehie ahụ bịakwutere Jisọs, Jisọs gwara ya, "Agbagharawo mmehie gị. Azọpụtala gị n'ihi na ị tụkwasịrị m obi." Jisọs sịrị na mgbe ọbụla ndị mmadụ hụrụ Chineke n'anya n'ezie, nke a na-egosi na Chineke agbagharawo mmehie ha. Jisọs Onye Nzọpụta kpọrọ ndị mmadụ ka ha soro ya. Mgbe onye ohi ahụ nọ n'obe kwere na Jisọs wee rịọ ya ka o zọpụta ya. Jisọs sịrị ya, "Taa ka mụ na gị ga-anọ na paradaịs." Ndị kpebiri isoro Jisọs nwere ike ịmalite mmekọ ha na Chineke, site n'ikwu okwu a dịka nke a: Chineke, onye nwe ụwa n'uju ya, Ị dị nsọ bụrụkwa onye ebuliri elu. A na m ekele Gị, n'ihi na ị hụrụ m n'anya dịka nna. Ọ na-ewute m na enupụwo m isi n'iwu gị, wee mehie megide gị. Ekele m Gị na I zitere Jisọs ka ọ nwụọ n'obe n'ihi m, sitekwa n'ọnwụ bilie. Ekele m Gị n'ihi na Ọ tara ahụhụ n'ihi mmehie m. Achọrọ m iso ụzọ gị ma nabata Jisọs dịka Onye Nzọpụta m na onye nwe m. Ekele kwam Gị n'ihi na Ị gbaghara m mmehie m, ma meghere m ụzọ ịbịa binyere Gị ruo ebighị ebi. A na m arịọ gị ka I nye m Mmụọ Nsọ Gị, ka ọ nọnyere m, ma gosi kwa m ụzọ Gị. Ka O nye m ike m ga-eji hụ n'anya site n'obi m, ma bikwaa ndụ ga-atọ Gị ụtọ. Ka ndị mmadụ too gị, ebe niile n'ime ụwa. Amen. Jisọs kwuru maka ndị na-eso ụzọ ya, atụrụ m na-anụ olu m, ama m ha, ha onwe ha na-eso kwa m. Ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ezukọtakwa, ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị. Ha na-amụkwa okwu Chineke bụ Akwụkwọ Nsọ ha na-agbaso nzọụkwụ ya, na-ekekọrịta ịhụnanya ya n'ebe ndị ọzọ nọ. Jisọs na-enyere ha aka ma na-agba ha ume site n'ike nke Mmụọ Chineke onye bi n'ime ha. Ha na-echetakwa okwu Jisọs gwara ha mgbe ọ na-arịgoro n'eluigwe: Enyela m ikike niile dị n'eluigwe nke dị n'elu ụwa nakwa nke dị n'okpuru ụwa. Mụ onwe m na-anọnyekwara unu ruo ọgwụgwụ ụwa.
JesusFilm