JESUS·61 of 61

Invitation to Know Jesus Personally

A narrator gives an invitation to know God personally. The invitation is open to everyone. It means turning to God and trusting Jesus with our lives and to forgive our sins. We can speak to Him in prayer when we're ready to become followers of Jesus.

Ask yours

Bible Quotes

Share
Free Resources

Want to understand the Bible more deeply?

Join our Bible study

Transcript

Igbo (Asụsụ Igbo)
Ogologo oge gara aga, ndị amụma dere n'Akwụkwọ Nsọ, na Chineke ga-ezite Onye Nzọpụta. ka ọ zọpụta ndị mmehie ma mee ka ha na Chineke dị n'udo Ndụ Jisọs gosiri nke ọma n'ezie na ọ bụ Onye Nzọpụta onye Chineke kwere nkwa izite n'ụwa. Onye amụma Aịsaịa dere na otu agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụ nwoke, o mezuru dịka o kwuru. Chineke sitere n'ike Ya mee ka Meri tụrụ ime, mụkwa Jisọs. Dịka edere n'Akwụkwọ Nsọ, ọmụmụ nke ịrịba ama ya bụ akara nke Chineke, na nwa ahụ bụ Onye Nzọpụta, onye Chineke kpọrọ nwa Ya. Mgbe ndị mmadụ hụrụ Jisọs, ha nwetara ụdịdị na ike nke Chineke. Ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa ma gbaghara ha mmehie ha, o kwere ha nkwa ọnọdụ n'alaeze ya dị ebighị ebi. Jisọs jiri ndụ ya chụọ aja ma hụkwa ahụhụ mmadụ niile ma o siri n'ọnwụ bilie, igosi na ike ya karịrị ike nke ọnwụ. Jisọs Onye Nzọpụta sịrị, enwere m ike inyefe ndụ m, n'ike iwere kwa ya ọzọ. Ndụ Jisọs dị nnọọ otu ahụ ndị amụma dere ya, na ndụ Mesaịa ga-adị. Ndụ ya kwadoro n'okwu nke ndị amụma bụ eziokwu na nke na-adịghị agbanwe. Dịka ndị amụma kwuru ya, "Okwu nke onye-nwe anyị adịghị agha agha." Okwu gị na-adị ruo ebighị ebi. Mesaịa ahụ n'onwe ya sịrị, "Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu niile nke ọnụ m agaghị agabiga ma ọlị." Na mbido, Chineke kere nwoke na nwanyị, ka ha na Chineke nwekọọ ihe. Ma ha atụkwasịghị Chineke obi, ha nupụrụ isi n'iwu Ya. Omume a kewapụrụ ha n'ebe Chineke nọ. N'ime Akwụkwọ Nsọ, edere ya na "Mmadụ niile emehiewo." Ma "Ụgwọ ọrụ nke mmehie ahụ bụ ọnwụ." Ndị mmehie apụghị ịdị ndụ n'ime mmekọrịta ha na Chineke. Ma dịka Chineke họpụtara ebule ịnwụ n'ọnọdụ nwa Abraham, otu a o zitere Jisọs bụ Onye Nzọpụta ka ọ nwụọ n'ihi ụmụ Adam. Ndụ ya, ọnwụ ya, na mbilite n'ọnwụ ya, weghachiri mmekọrịta n'etiti Chineke na ndị na-atụkwasị Ya obi. Onye ozi Pita sịrị: "Jisọs bụ nanị otu onye ahụ, ndị amụma niile kwuru sị, na Chineke ga-agbaghara mmehie nke ndị niile kwere na ya." N'ihi nke a ndị niile sooro Jisọs ga-agbanarị ahụhụ nke ọkụ ala mmụọ ma soro Chineke na-ebi n'alaeze Ya ruo ebighị ebi. Mgbe Jisọs siworo n'ọnwụ bilie, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Ndị mmadụ ga-ekwusa n'aha m nye mba niile, na Chineke na-agbaghara mmehie nke ndị nwere nchegharị." Jisọs kwuru sị na ya ga-ezite Mmụọ Nsọ ka o binyere ndị na-eso ụzọ ya, ịkụziri ha eziokwu na inye ha ike isoro ụzọ nke Chineke. Mgbe nwanyị mmehie ahụ bịakwutere Jisọs, Jisọs gwara ya, "Agbagharawo mmehie gị. Azọpụtala gị n'ihi na ị tụkwasịrị m obi." Jisọs sịrị na mgbe ọbụla ndị mmadụ hụrụ Chineke n'anya n'ezie, nke a na-egosi na Chineke agbagharawo mmehie ha. Jisọs Onye Nzọpụta kpọrọ ndị mmadụ ka ha soro ya. Mgbe onye ohi ahụ nọ n'obe kwere na Jisọs wee rịọ ya ka o zọpụta ya. Jisọs sịrị ya, "Taa ka mụ na gị ga-anọ na paradaịs." Ndị kpebiri isoro Jisọs nwere ike ịmalite mmekọ ha na Chineke, site n'ikwu okwu a dịka nke a: Chineke, onye nwe ụwa n'uju ya, Ị dị nsọ bụrụkwa onye ebuliri elu. A na m ekele Gị, n'ihi na ị hụrụ m n'anya dịka nna. Ọ na-ewute m na enupụwo m isi n'iwu gị, wee mehie megide gị. Ekele m Gị na I zitere Jisọs ka ọ nwụọ n'obe n'ihi m, sitekwa n'ọnwụ bilie. Ekele m Gị n'ihi na Ọ tara ahụhụ n'ihi mmehie m. Achọrọ m iso ụzọ gị ma nabata Jisọs dịka Onye Nzọpụta m na onye nwe m. Ekele kwam Gị n'ihi na Ị gbaghara m mmehie m, ma meghere m ụzọ ịbịa binyere Gị ruo ebighị ebi. A na m arịọ gị ka I nye m Mmụọ Nsọ Gị, ka ọ nọnyere m, ma gosi kwa m ụzọ Gị. Ka O nye m ike m ga-eji hụ n'anya site n'obi m, ma bikwaa ndụ ga-atọ Gị ụtọ. Ka ndị mmadụ too gị, ebe niile n'ime ụwa. Amen. Jisọs kwuru maka ndị na-eso ụzọ ya, atụrụ m na-anụ olu m, ama m ha, ha onwe ha na-eso kwa m. Ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ezukọtakwa, ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị. Ha na-amụkwa okwu Chineke bụ Akwụkwọ Nsọ ha na-agbaso nzọụkwụ ya, na-ekekọrịta ịhụnanya ya n'ebe ndị ọzọ nọ. Jisọs na-enyere ha aka ma na-agba ha ume site n'ike nke Mmụọ Chineke onye bi n'ime ha. Ha na-echetakwa okwu Jisọs gwara ha mgbe ọ na-arịgoro n'eluigwe: Enyela m ikike niile dị n'eluigwe nke dị n'elu ụwa nakwa nke dị n'okpuru ụwa. Mụ onwe m na-anọnyekwara unu ruo ọgwụgwụ ụwa.
JesusFilm